John 9

Jisọs agwọọ onye ìsì

1Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya. 2Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?”

3Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya. 4Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ. 5Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”

6Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya. 7Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.

8Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?” 9Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.”

Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.”

Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”

10Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?”

11Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”

12Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?”

Ọ sịrị, “Amaghị m.”

Ndị Farisii emee nchọpụta maka ọgwụgwọ ahụ

13Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii. 14Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya. 15Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”

16Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.”

Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.

17Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.”

Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”

18Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya. 19Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”

20Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya. 21Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.” 22Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha. 23Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”

24Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”

25Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”

26Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”

27Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”

28Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis. 29Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”

30Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m. 31Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya. 32Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. 33Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”

34Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi.

Ikpu ìsì nke ime mmụọ

35Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya, “I kweere na Nwa nke Mmadụ?”

36Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.”

37Jisọs sịrị ya, “Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.”

38Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.

39Jisọs sịrị, “Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.”

40Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?”

41Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”

Copyright information for IboBIU